Decreasing Unity Among the Igbo:
Osi onye na-aka?
Onye hara mmiri na-ezo n'obodo anyi?
Onye ukwu na-aju, onye nta na-ju
Soro mmuo gbuo mmadu, soro mmadu gaa mgbaru
I na-aju onye?
Onye Politiki,
Irea'na obodo gi?
I sikwa na-ihuru ala Igbo n'anya?
Keduzi ka I ji si na onye'Igbo eluyi ogo ibu
onye'siala?
Okwo m n'azu ma okpa akpu n'ala
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Oji Igbo atu mgbere
Isi na Igbo enweghi eze?
Imakwa na onye fee eze, eze eru ya
Ndi abanyi di egwu
Egbupu isi, nti eso ya
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Adi abua eketa oke ato
Ichetekwara na anya ka-eji eke ihe di n'ofe?
Akwa okuko bu oku, nke ogazi
buru anu
Mere mere n'ihu, kwampiti n'azu
Ka ima nkea, ima nke-ozo
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Onye onokpom!
Iriala oke ndi'Igbo nani n’afo gi?
Okwa I gbanaala Abuja ugbua
Anu gbalaa taa echi bu nta
Echi bia choo votu anyi ozo
Osi gi na-aka,
osighi m na-aka
Okamma na-mba
Keezi ka iji
si na ezi ka ulo mma?
Ighaghi ihu ihe I mere onwe gi
Oji akwa awu ahu marakwa onwe ya
Ubochi nta ka achuo n'owere nchi
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Enyi mere enyi ya!
Obu na imaghi na Igwe-bu-ike?
Aka-nri kwoo aka-ekpe, aka-ekpe akwoo aka-nri
Ube jichaa o dibara uguru
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Gi bu oke-uno
Okwa gi gwara oke-ofia na azu di n'ngiga?
Ofeke na-amaghi mgbe ekere nku ukwa
Oji akwa asa ahu mara onwe ya
Ndi oso chi egbu
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Isi na onye bu igu ka ewu na-eso?
Odi mma, I ga-eji na unwu di
Wee si na isi-ede ka isi nne gi?
Tufia kwa
Ka be-onye adina, o ga-anariri
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Ukpara okpoko buuru, nti chiri ya
Mgbe ikuku kuru, anya ga-ahunu ike okuko
Ubochi ndi abughi ahia
Ha oga-azu eke umu ndi-mmuo?
Ekesia n'ama, eburu gaba n'obi
Osi gi na-aka, osighi m na-aka
Gi bu ofeke
Obu na imaghi na egbuo dike na-ogu uno,
O rue na-ogu ezi achoba ya
Onye iro gbuo agu, asi na o gburu aturu
Were ire gua eze gi onu
Osi gi na-aka,
osighi m na-aka
![]() |
| Okey Emmanuel |











